Psalms 2

Onye Chineke tere mmanụ

1Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo?
Ya bụ, ịgbakọta nʼihi izu ọjọọ

Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
2Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha,
ndị na-achị achị na-agbakọtakwa
imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.
3Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị
ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.”

4Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị.
Onyenwe anyị na-akwa ha emo.
5Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba
mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.
6“Mụ onwe m eguzobela m eze m
na Zayọn, ugwu m dị nsọ.”
7Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị:

Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m;
taa abụrụla m nna gị.
8Rịọọ m,
aga m enye gị mba niile nke ụwa
ka ha bụrụ ihe nketa gị.
9Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha,
tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.”

10Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche;
ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.
11Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe;
jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
12Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya,
ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu.
Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya.
Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.
Copyright information for IboBIU